Chineke nwe ihe niile
Chineke nwe ihe niile dị n'ụwa
...ọ gọziri Ebram sị ya, “Ngọzị dịrị Ebram site nʼaka Chineke nke kachasị ihe niile elu, Onye kere eluigwe na ụwa. (Jenesis 14:19)
Ma Ebram zara eze Sọdọm sị, “Eweliri m aka m elu ṅụọ iyi nye Onyenwe anyị Chineke nke kachasị ihe niile elu, Onye kere eluigwe na ụwa, sị (Jenesis 14:22)
Mosis gwara Fero sị ya, “Mgbe m si nʼobodo a pụọ, aga m esetipụ aka m nʼebe Onyenwe anyị nọ, egbe eluigwe a, na ifufe a nke ya na mkpụrụ mmiri so ga-akwụsịkwa. Site na nke a, ị ga-amata na ụwa niile bụ nke Onyenwe anyị. (Ọpụpụ 9:29)
Nʼihi nke a, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi nke ọma ma debe ọgbụgba ndụ m, unu ga-abụ ihe onwunwe nke m dị oke ọnụahịa. Nʼezie, ụwa niile bụ nke m, (Ọpụpụ 19:5)
Ụwa na eluigwe na ebe niile kachasị elu nke eluigwe, na ihe niile dị nʼime ha, bụ nke Onyenwe anyị Chineke gị. (Diuteronomi 10:14)
Gị onwe gị, Onyenwe anyị nwe ịdị ukwu, na ike, na ịma mma, na ugwu eze, na ebube, nʼihi na ihe niile nʼeluigwe na nʼụwa bụ nke gị. Gị onwe gị, Onyenwe anyị nwe alaeze. Gị kwa ka e buliri elu dịka onye na-achị isi nʼelu ihe niile. “Ma onye ka m bụ, ole ndị kwa ka ụmụ Izrel bụ, na i kweere ka anyị gbasapụ aka anyị nye gị onyinye. Ihe niile anyị nwere sitere nʼaka gị bịa, ha kwa ka anyị na-enyeghachi gị. Anyị bụ ndị ọbịa na ndị mbịarambịa nʼihu gị, dịka nna nna anyị ha. Ụbọchị ndụ anyị nʼụwa dị ka onyinyo, nke olileanya na-adịghị nʼime ya. O, Onyenwe anyị Chineke anyị, ihe niile ndị a anyị bukọrọ maka iji rụọra gị ụlọnsọ si nʼaka gị bịa. Ha niile bụkwa nke gị. (1 Ihe E Mere 29:11, 14-16)
Olee onye m ji ụgwọ nke m na-aghaghị ịkwụ? Ihe niile dị nʼokpuru eluigwe bụ nke m. (Job 41:11)
Abụ Ọma Devid. Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke Onyenwe anyị; ụwa na ndị niile bi nʼime ya. (Abụ Ọma 24:1)
Ọ bụrụ na agụụ agụọ m, agaghị m agwa gị ya, nʼihi na ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke m. (Abụ Ọma 50:12)
O Chineke, bilie kpee ụwa ikpe, nʼihi na mba niile bụ ihe nketa gị. (Abụ Ọma 82:8)
Ọ bụ gị nwe eluigwe; gị nwekwa ụwa, ọ bụ gị tọrọ ntọala elu ụwa dum, na ihe niile dị nʼime ya. (Abụ Ọma 89:11)
Ebe niile michasịrị emi nke ụwa dị nʼaka ya, ebe kachasị elu nke ugwu niile bụkwa nke ya. Osimiri niile bụ nke ya, nʼihi na ọ bụ ya kere ha, aka ya kpụrụ ala akọrọ niile. (Abụ Ọma 95:4-5)
Onyenwe anyị, ọrụ aka gị dị ọtụtụ. Ọ bụ site nʼamamihe ka i ji kee ha. Elu ụwa niile jupụtara nʼihe niile i kere eke. (Abụ Ọma 104:24)
Nʼihi na, “Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 10:26)
Ilu na-egosi na Chineke nwe ihe niile
“Ọzọ, ọ ga-adị ka otu nwoke chọrọ ịga njem. Ọ kpọkọtara ndị ohu ya niile nyefee ha akụnụba ya nʼaka. O nyere onye nke mbụ talenti ise, nke abụọ ka o nyere talenti abụọ. O nyere onye nke ikpeazụ otu talenti. O nyere ha nʼotu nʼotu dị ka ike ha ha. Mgbe ahụ ọ hapụrụ ha gaa ije ya. Onye ahụ natara talenti ise weere ego ahụ malite ịzụ ahịa. Ngwangwa o retara talenti ise ọzọ nʼuru. Otu a kwa, onye nke e nyere talenti abụọ zụpụtakwara talenti abụọ ọzọ nʼuru. Ma onye ahụ natara otu talenti gara gwuo ala lie ego nna ya ukwu, nʼihi ichezi ya nke ọma. “Mgbe ogologo oge gasịrị, nna ukwu ndị ohu ahụ lọtara site nʼije ya. Ọ kpọkọtara ha niile ka ha gụzie akụ ya. Onye ahụ natara talenti ise batara wetakwa ise ọzọ. Ọ gwara nna ya ukwu sị, ‘Ị nyere m talenti ise, ma ugbu a azụpụtala m talenti ise ọzọ!’ “Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ị ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.’ “Onye nke e nyere talenti abụọ bịara sị, ‘Nna anyị ukwu, i nyere m talenti abụọ, ma lee, eritala m talenti abụọ ọzọ nʼuru.’ “Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma. Ị bụ ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ị ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.’ “Onye e nyere otu talenti batara sị, ‘Nna anyị ukwu, amaara m onye ị bụ. Ị bụ onye aka ntagide. Ị na-ewe ihe ubi nʼebe ị na-akụghị mkpụrụ. Ị na-achịkọtakwa nʼebe ị na-agbasaghị. Nʼihi nke a, atụrụ m egwu, a gara m liere gị ego talenti gị nʼala. Lee ihe gị werekwa.’ “Nna ya ukwu zara ya sị, ‘Ohu ọjọọ na onye umengwụ. Ị maara na m na-ewe ihe ubi nʼebe m na-akụghị mkpụrụ, na-achịkọtakwa nʼebe m na-agbasaghị. Ị gaara etinye ego m nʼaka ndị na-echekwa ego, ndị gaara akwụghachi ya na ọmụrụnwa ya, nke m gaara anata mgbe m lọghachiri. “ ‘Napụtanụ ya talenti ahụ o ji, were ya nye onye ji talenti iri. (Matiu 25:14-28)
Onyenwe anyị na-ejide ihe niile ọnụ
Ọ na-enwupụta ebube ya na-anọchitekwa anya ụdịdị ya, ebe o ji okwu ya dị ike na-ejikọta ihe niile. Mgbe ọ sachapụrụ ma hichapụkwa mmehie niile, ọ nọdụrụ nʼaka nri nke Onye dị ukwuu, dị elu nʼeluigwe. (Ndị Hibru 1:3)
Ya onwe ya nọ tupu ekee ihe niile, ọ bụkwa nʼime ya ka ejikọtara ihe niile nʼotu. (Ndị Kọlọsị 1:17)
Ihe ụfọdụ Chineke nwe
Ala
“ ‘Chetanụ na ala bụ nke m, nʼihi nke a, o kwesighị ka unu ree ala ọbụla kpamkpam. Unu bụ naanị ndị ọbịa na ndị nlekọta nye m. (Levitikọs 25:23)
Ọlaedo na ọlaọcha
Ị chịrị ọlaọcha na ọlaedo ndị ahụ mara mma, bụ nke m nyere gị, were ha kpụọrọ onwe gị oyiyi nwoke dị iche iche, ndị ị na-akpọ isiala nye. Nʼụzọ dị otu a ka gị na ha si na-akwakọ iko. (Izikiel 16:17)
‘Ọlaọcha niile na ọlaedo niile, bụ nke m.’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara. (Hegai 2:8)
Anụmanụ
...nʼihi na ụmụ anụmanụ niile nke oke ọhịa bụ nke m, ha na ehi niile nọ nʼelu otu puku ugwu. Amaara m ụmụ nnụnụ niile nọ nʼelu ugwu niile, ihe niile e kere eke nọ nʼọhịa bụ nke m. (Abụ Ọma 50:10-11)
Chineke na-achị ihe ọ bụla na-eme
Onyenwe anyị na-achị ihe niile na-eme n'ụwa
Gị onwe gị, Onyenwe anyị nwe ịdị ukwu, na ike, na ịma mma, na ugwu eze, na ebube, nʼihi na ihe niile nʼeluigwe na nʼụwa bụ nke gị. Gị onwe gị, Onyenwe anyị nwe alaeze. Gị kwa ka e buliri elu dịka onye na-achị isi nʼelu ihe niile. Akụnụba na nsọpụrụ na-esite nʼebe ị nọ abịa. Gị onwe gị na-achịkwa ihe niile. Ọ bụkwa nʼaka gị ka ume na ike dị ibuli ihe niile elu, na inye ihe niile ike. (1 Ihe E Mere 29:11-12)
Onyenwe anyị na-eme ihe ọbụla masịrị ya nʼeluigwe na elu ụwa na nʼoke osimiri na nʼime ogbu mmiri niile. (Abụ Ọma 135:6)
A na-efe nza, nʼihi ịchọpụta uche Onyenwe anyị, maọbụ Chineke nʼonwe ya na-ekpebi ihe a ga-efeta na nza ahụ. (Ilu 16:33)
Onyenwe anyị na-eduzi nzọ ụkwụ niile nke mmadụ. Olee otu onye ọbụla ga-esi ghọta ụzọ ha? (Ilu 20:24)
Daniel sịrị, “Otuto dịrị aha Chineke ruo mgbe ebighị ebi; amamihe na ike dị nʼaka ya. Ọ na-agbanwe oge na mgbe dị iche iche; Ọ na-ebuli ndị eze na-akwatụkwa ha. Ọ na-enye onye maara ihe amamihe, ma na-enyekwa onye nwere mmụọ nghọta ihe ọmụma. (Daniel 2:20-21)
Onyenwe anyị na-ekwe ka ọnọdụ siri ike mee
Mgbe ahụ, ụmụnne ya ndị ikom na ụmụnne ya ndị inyom, na ndị enyi ya niile bịara soro ya rie oriri nʼụlọ ya, na-akasị ya obi nʼihi iru ụjụ ya niile. Ha kasịkwara ya obi nʼihi ọnwụnwa niile Onyenwe anyị mere ka ọ bịakwasị ya. Ha niile nʼotu nʼotu nyere ya onyinye ọlaọcha na mgbaaka ọlaedo. (Job 42:11)
Mgbe ahụ, ụwa niile, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ, ga-amata nʼezie na Chineke ọzọ adịghị, karịa m. Abụ m Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị. Ọ bụ m kpụrụ ìhè, keekwa ọchịchịrị. Ọ bụ m na-ezite ọganihu, na-ekekwa ịla nʼiyi. Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, na-eme ihe ndị a niile. (Aịzaya 45:6-7)
Onye pụrụ ikwu okwu mekwa ka ọ dị ire ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị enyeghị iwu ka ọ dị otu ahụ? Ọ bụghị site nʼọnụ Onye kachasị ihe niile elu ka ihe ọma na ihe ọjọọ si abịa? (Abụ Akwa 3:37-38)
Mgbe a fụrụ opi nʼobodo, ọ bụ na ndị bi nʼime ya adịghị ama jijiji? Mgbe mbibi na ịla nʼiyi dakwasịrị obodo ọbụla ọ bụghị Onyenwe anyị mere ka ọ dị? (Emọs 3:6)
Onyenwe anyị na-eji ọnọdụ ọ bụla mee ihe ọma na ndụ ndị na-atụ egwu Chineke
Anyị maara na ihe niile na-arụkọta ọrụ maka ọdịmma ndị hụrụ Chineke nʼanya bụ ndị a kpọrọ dịka uche nsọ ya siri dị. (Ndị Rom 8:28)
Ihe atụ nke Onyenwe anyị na-ekwe ka ọnọdụ siri ike mee maka ọdịmma ikpeazụ
Ma otu ọ dị, ka ọ ghara iwute unu, unu atakwala onwe unu ụta nʼihi orure unu rere m. Nʼihi na ọ bụ nʼihi ichebe ndụ unu ka Chineke ji buru ụzọ zite m nʼebe a. Oge ụnwụ agwụchabeghị. Ọ bụ ezie na afọ abụọ nke oke ụnwụ agafeela, ma ọ fọdụrụ afọ ise ọzọ nʼihu, oge a na-agaghị akọ ihe ọbụla nʼala, maọbụ iwere ihe ọbụla nʼubi. Chineke zitere m ka m buru ụzọ bịa nʼebe a nʼihi ime ka ndụ fọdụrụ unu nʼụwa, na ịzọpụta ndụ unu site nʼụzọ nnapụta dị oke egwu. “Ya mere, ọ bụghị unu zitere m nʼebe a, kama ọ bụ Chineke. Ya onwe ya emeela ka m ghọọrọ Fero nna, na onyeisi ezinaụlọ ya niile, na onye na-achị ala Ijipt niile. Ugbu a, meenụ ngwa lakwuru nna m, sị ya, ‘Ihe ndị a ka Josef nwa gị nwoke kwuru, Chineke emeela m onye na-achị Ijipt niile. Egbula oge ịbịakwute m. (Jenesis 45:5-9)
Echiche onye anụ ahụ banyere ịchị ihe na-eme
Ahụrụ ihe ọzọ nʼokpuru anyanwụ, ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ na-agbata ihe, ọ bụkwaghị onye sikarịrị ike na-emeri nʼagha; ọ bụghị ndị maara ihe ka nri dịrị, ọ bụghị ndị nwere nghọta ka akụnụba dịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị nka ka amara na-adịrị; kama ọ bụ mgbe na ihe ndaba na-eme ka ihe ndị a dịrị. (Ekiliziastis 9:11)
Ihe ụfọdụ Onyenwe anyị na-achị
Onyenwe anyị na-eduzi obi mmadụ
Iyi dị iche iche nke jupụtara na mmiri ka obi eze bụ nʼaka Onyenwe anyị, nke ọ na-ahazi nʼụzọ ọbụla dị ya mma. (Ilu 21:1)
Onyenwe anyị nwere ike ime ka ndị na-atụ egwu Chineke nweta ihu ọma n'ebe ndị ọzọ nọ
Onyenwe anyị nọnyeere ya. O meere ya ebere, mekwa ka o nweta ihuọma nʼebe onyeisi ndị nche ụlọ mkpọrọ ahụ nọ. (Jenesis 39:21)
Ha sokwa mee mmemme achịcha na-ekoghị eko, nke ha mere ụbọchị asaa. Oke ọṅụ jupụtara nʼala Izrel niile nʼihi na Onyenwe anyị mere ka eze Asịrịa nwee obiọma nʼebe Izrel nọ, nyere ha aka iwugharị ụlọnsọ ukwu Chineke, onye bụ Chineke Izrel. (Ezra 6:22)
Nyekwa m akwụkwọ ozi m ga-enye Asaf, onye na-elekọta ọhịa eze, ka o nye m osisi nke a ga-eji rụzie ọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ụlọnsọ, na nke a ga-eji rụọ mgbidi obodo ahụ, na nke m ga-eji rụọ ụlọ nke aka m.” Eze meere m ihe ndị a niile, nʼihi na aka ebere Chineke dịnyere m. Akọọrọ m ha ọchịchọ ahụ Chineke tinyere m nʼobi na ihe mụ na eze kwuru, na otu o si kwadoo ihe m gwara ya. Ha zara m sị, “Ọ dị mma, ka anyị wugharịanụ mgbidi ahụ.” Ọrụ ahụ bidokwara na-atụfughị oge. (Nehemaya 2:8, 18)
Ihe atụ nke ndị Izrel napụrụ ndị Ijipt ihe
“Aga m emekwa ka unu nweta amara nʼihu ndị Ijipt, ka unu ghara ịgba aka mgbe unu na-ala. Nwanyị ọbụla ga-arịọ site nʼaka nwanyị Ijipt onye agbataobi ya na nwanyị ọbịa bi nʼụlọ ya, ihe niile e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ, na akwa dị iche iche. Unu ga-eyikwasị ha ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom, bịa si otu a kwakọrọ ngwongwo ndị Ijipt.” (Ọpụpụ 3:21-22)
Ha mekwara ihe ndị ọzọ dịka Mosis gwara ha. Ha rịọrọ ndị Ijipt ka ha nye ha ihe iji ngwa nke ọlaọcha na ọlaedo, na uwe. Onyenwe anyị nyere ndị ya amara nʼihu ndị Ijipt, ha nyere ha ihe niile ha rịọrọ. Site nʼụzọ dị otu a, ụmụ Izrel napụtara ndị Ijipt ihe niile ha ji biri nʼụlọ. (Ọpụpụ 12:35-36)
Onyenwe anyị na-eme ka obi ụfọdụ ndị sie ike
Aga m eme ka obi Fero sie ike ka ọ chụso unu ọsọ nʼazụ, ma m ga-ewetara onwe m otuto site na Fero na ndị agha ya niile. Ndị Ijipt niile ga-ama na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.” Ndị Izrel mekwara otu ahụ. (Ọpụpụ 14:4)
Ma Saịhọn, eze Heshbọn, ekweghị ka anyị si nʼala ya gafee. Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu mere ka mmụọ ya sie ike, meekwa ka o mesie obi ya ike, ka o si otu a nyefee ya nʼaka unu dịka ọ mere ugbu a. (Diuteronomi 2:30)
Onyenwe anyị na-achị anyaukwu nke obi
Ugboro atọ nʼafọ ka ndị ikom unu niile ga-abịa chee onwe ha nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị nke Izrel. Nʼihi na aga m esite nʼihu unu chụpụ mba dị iche iche. Meekwa ka ala unu saa mbara. Ọ dịghị onye ọbụla ga-enwe anya ukwu nʼebe ala unu dị, mgbe unu na-aga iche onwe unu nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, ugbo atọ nʼafọ. (Ọpụpụ 34:23-24)
Onyenwe anyị na-achị mba niile
O sitere nʼaka otu onye, bụ mmadụ mbụ ahụ, kee agbụrụ niile nke mmadụ nʼotu nʼotu, ka ha biri nʼelu ụwa dum. O jiri aka ya kewachaa oge ọgbọ ọbụla ga-anọ na oke niile nke ebe obibi ha. (Ọrụ Ndị Ozi 17:26)
Ma otu onye nke Chineke bịakwutere ya, sị ya; “Eze, ka ndị agha a si Izrel ghara isonyere gị, nʼihi na Onyenwe anyị anọnyereghị ndị Izrel, ọ nọnyereghị onye ọbụla sitere nʼIfrem. A sịkwarị na i jiri obi dimkpa ga agha a, Chineke ga-eme ka ndị iro gị merie gị, nʼihi na Chineke bụ onye nwere ike inyere mmadụ aka maọbụ ime ka ọ sụọ ngọngọ.” Amazaya sịrị onye nke Chineke ahụ, “Gịnị kwanụ ka anyị ga-eme banyere narị ego talenti m kwụrụ maka ndị agha Izrel?” Onye nke Chineke ahụ zara, “Onyenwe anyị pụrụ inye gị karịa nke ahụ.” (2 Ihe E Mere 25:7-9)
“Ahụhụ ga-adịrị Asịrịa onye bụ mkpara nke iwe m. Nʼaka ya ka mkpọ nke ọnụma m dị. Ana m ezipu ya imegide mba a na-amaghị Chineke, m na-eziga ya imegide ndị na-akpasu m iwe, ka ha kwakọrọ ihe nkwata nʼagha ha, pụnakwara ha ụfọdụ nʼike, nakwa ịzọtọ ndị ha niile nʼala dịka apịtị nke okporoụzọ. (Aịzaya 10:5-6)