Ụtụ isi/ụtụ

Ịkwụ ụtụ isi bụ iwu Akwụkwọ Nsọ, nke Jizọs na Pọl onyeozi kwadoro, na-amata ikike ọchịchị. Ihe atụ n'Akwụkwọ Nsọ niile na-egosi ụkpụrụ a, na-egosikwa mgbe e nwere ihe dị iche.

Onyenwe anyị anaghị ele mmadụ anya n'ihu

Nʼihi na Onyenwe anyị, bụ Chineke unu bụ Chineke kachasị chi niile, bụrụkwa Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile. Chineke ukwu ahụ, onye dị ike dịkwa egwu, onye na-adịghị ele mmadụ anya nʼihu, ọ nakwaghị eri ngarị. (Diuteronomi 10:17)
Ugbu a, kwenụ ka egwu Onyenwe anyị dịrị nʼime unu. Kpeenụ ikpe ziri ezi, nʼihi na nʼebe Onyenwe anyị Chineke anyị nọ, ikpe ikpe na-ezighị ezi, maọbụ ile mmadụ anya nʼihu maọbụ iri ngarị adịghị ya.” (2 Ihe E Mere 19:7)
Onye na-adịghị ekpe ikpe mmegide nye ụmụ ndị ikom eze, onye na-adịghị emenyere ndị ọgaranya, ma megbuo ndị ogbenye, nʼihi na ha niile bụ ọrụ aka ya. (Job 34:19)
Ndị a na-ejere ozi, mesonụ ndị na-ejere unu ozi mmeso nʼụzọ dị otu a. Abarala ha mba, nʼihi na ị matara na unu nwere naanị otu Nna ukwu nọ nʼeluigwe. Ile mmadụ anya nʼihu adịghịkwa nʼebe ọ nọ. (Ndị Efesọs 6:9)

Anyị ekwesịghị ile mmadụ anya n'ihu

Ile mmadụ anya nʼihu nʼoge ikpe jọgburu onwe ya. Ma ụfọdụ ndị ikpe na-eme ihe na-ezighị ezi, ọ bụladị, nʼihi iberibe nri. (Ilu 28:21)

Ile mmadụ anya n'ihu bụ mmehie

Ọ bụrụ na unu na-edebezuo iwu nke eze anyị dịka e dere ya nʼAkwụkwọ Nsọ, “Hụnụ ndị agbataobi unu nʼanya dịka unu onwe unu,” unu na-eme ihe ziri ezi. Ma ọ bụrụ na unu ele mmadụ anya nʼihu, unu na-eme mmehie. Nʼebe iwu dịkwa, unu bụ ndị na-emebi iwu. (Jemis 2:8-9)

Elela ọgaranya anya n'ihu

Ụmụnna m, dịka ndị kweere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye dị ebube, ka unu hapụ ile mmadụ anya nʼihu. Ọ bụrụ na onye ọgaranya yi uwe mara mma, yikwara mgbaaka ọlaedo na mkpịsịaka ya, abata nʼụlọ nzukọ unu, ọ bụrụkwa na nwa ogbenye abata nke yi uwe na-adịghị ọcha, ọ bụrụ na unu elee onye ọgaranya ahụ yi uwe mara mma anya sị ya, “Bịa nọdụ nʼotu oche a e debere iche nʼihi gị,” ma unu asị onye ogbenye ahụ, “Di anyị, guzo nʼebe ahụ,” maọbụ “Bịa nọdụ ala nʼakụkụ ebe a ụkwụ m dị,” ọ bụ na unu akpabeghị oke nʼetiti onwe unu, bụrụkwa ndị ji ile anya nʼihu na obi ọjọọ na-ekpe ikpe? Geenụ ntị ka m gwa unu ụmụnna m, ọ bụ na unu amataghị na Chineke ahọpụtala ndị ahụ ụwa gụrụ dịka ndị ogbenye, mee ka ha bụrụ ọgaranya site nʼokwukwe ha, ka ha ketakwa alaeze ahụ o kwere nkwa inye ndị hụrụ ya nʼanya? Ma gịnị ka unu na-eme? Unu na-akparị ndị ogbenye! Ọ bụghị ndị ọgaranya na-emegbu unu? Ọ bụkwaghị ha bụ ndị na-adọkpụgharị unu aga nʼụlọikpe? Ọ bụghị ha bụ ndị na-ekwulu aha ọma ahụ nke a gụrụ unu? Ọ bụrụ na unu na-edebezuo iwu nke eze anyị dịka e dere ya nʼAkwụkwọ Nsọ, “Hụnụ ndị agbataobi unu nʼanya dịka unu onwe unu,” unu na-eme ihe ziri ezi. Ma ọ bụrụ na unu ele mmadụ anya nʼihu, unu na-eme mmehie. Nʼebe iwu dịkwa, unu bụ ndị na-emebi iwu. (Jemis 2:1-9)

Elela onye ogbenye anya n'ihu

Nʼebe nwa ogbenye nọ, ị gaghị ekpelara ya nʼoge ikpe nʼihi na ọ bụ nwa ogbenye. (Ọpụpụ 23:3)
“ ‘Unu ekpela ikpe na-ezighị ezi, unu elela mmadụ anya nʼihu mgbe unu na-ekpe ikpe, ma onye unu na-ekpe ikpe ọ bụ ọgaranya maọbụ ogbenye. Kama kpeenụ ikpe kwụ ọtọ. (Levitikọs 19:15)

Ndị ndu/ndị ikpe ekwesịghị ile mmadụ anya n'ihu

Kpeenụ ikpe ziri ezi nye onye ukwu na onye nta. Elekwala ndị unu na-ekpe ikpe anya nʼihu, nʼihi na unu na-ekpe ikpe unu nʼọnọdụ Chineke.” Enyekwara m ha iwu sị ha wetaranụ m ikpe niile siri unu ike ka m leba ha anya. (Diuteronomi 1:17)
Ị ga-ahọpụta ndị ikpe, na ndịisi ozi nʼebo niile, na nʼobodo ọbụla Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị. Ha ga-eme ka ezi ikpe dịrị ndị mmadụ niile. Ekpekwala ikpe aghụghọ, maọbụ kpee ikpe ile mmadụ anya nʼihu. Erikwala ngarị, nʼihi na iri ngarị na-eme ka anya onye amamihe kpuo ìsì, meekwa ka okwu onye aka ya dị ọcha gbagọọ agbagọ. (Diuteronomi 16:18-19)
Ọ gwara ha si, “Lezienụ anya ihe unu na-eme nʼihi na ọ bụghị mmadụ ka unu na-ekpere ikpe kama ọ bụ Onyenwe anyị, onye na-anọnyere unu mgbe unu na-ekpebi ikpe. Ugbu a, kwenụ ka egwu Onyenwe anyị dịrị nʼime unu. Kpeenụ ikpe ziri ezi, nʼihi na nʼebe Onyenwe anyị Chineke anyị nọ, ikpe ikpe na-ezighị ezi, maọbụ ile mmadụ anya nʼihu maọbụ iri ngarị adịghị ya.” (2 Ihe E Mere 19:6-7)

A bụrụ onye na-ele mmadụ anya n'ihu ọnụ

“Nʼihi nke a, emeela m ka unu bụrụ ndị a na-elelị anya, na ndị e wedara nʼala nʼihu ndị mmadụ niile, nʼihi na unu agbasoghị ụzọ m, kama unu na-ele mmadụ anya nʼihu, nʼihe metụtara iwu.” (Malakaị 2:9)

Àgwà ziri ezi

Nweenụ otu uche n'ebe ibe unu nọ

Na-ebinụ nʼudo. A bụla onye mpako, unu na ndị ọnọdụ ha dị ala na-enwe mmekọrịta, echekwala na ị maara ihe niile. (Ndị Rom 12:16)

Were ndị ọzọ dị ka ndị dị mkpa karịa onwe gị

Emela ihe ọbụla nʼihi naanị ọdịmma nke gị, maọbụ bie ndụ nʼụzọ ịdọtara onwe gị otuto efu. Kama bụrụ onye wedara onwe ya ala, onye na-ahụ ndị ọzọ dị ka ndị ka ya mma. (Ndị Filipai 2:3)